Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 6:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. Bilienu, ka ayi rigo n'abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.

6. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.

7. Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n'irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.

8. Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n'ebe i nọ; ka M'we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala onye ọ bula nēbighi.

9. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n'elu alaka nile.

10. Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.

11. Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya.

12. Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n'otù: n'ihi na M'gēseti akam n'aru ndi bi n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

13. N'ihi na site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n'ugha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 6