Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 6:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n'akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n'ọnọdu nke aka ya.

4. Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.

5. Bilienu, ka ayi rigo n'abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.

6. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.

7. Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n'irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.

8. Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n'ebe i nọ; ka M'we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala onye ọ bula nēbighi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 6