Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 6:26-29 Bible Nso (IGBOB)

26. Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.

27. Onye-ọnwunwa-ọla ka M'boro gi n'etiti ndim, ya na ebe ewusiri ike; ka i we mara nwa kwa uzọ-ha.

28. Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi.

29. Eko erewo ọku; ọku erechapuwo opi: n'efu ka ha nuchaworo nke-uku; n'ihi na anuchapughi ndi ọjọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 6