Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 6:24-27 Bible Nso (IGBOB)

24. Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.

25. Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.

26. Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.

27. Onye-ọnwunwa-ọla ka M'boro gi n'etiti ndim, ya na ebe ewusiri ike; ka i we mara nwa kwa uzọ-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 6