2. Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M'gēme ka ọ la n'iyì.
3. Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n'akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n'ọnọdu nke aka ya.
4. Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.
5. Bilienu, ka ayi rigo n'abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.
6. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.
7. Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n'irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.