Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 6:12-21 Bible Nso (IGBOB)

12. Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n'otù: n'ihi na M'gēseti akam n'aru ndi bi n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

13. N'ihi na site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n'ugha.

14. Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.

15. Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e M'letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.

16. Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.

17. Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.

18. N'ihi nka nurunu, unu mba nile, mara kwa, unu nzukọ, ihe di n'etiti ha.

19. Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n'ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya.

20. N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.

21. N'ihi nka ka Jehova ji kwue otú a, si, Le, M'ganētiye ihe-isu-ngọngọ di iche iche n'iru ndi nka: nna na umu-ha gāsukwasi kwa ha ngọngọ; onye-ab͕ata-obi na eyì-ya gāla n'iyì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 6