Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 52:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla n'ala Hemat; o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.

10. Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla.

11. O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua; eze Babilon we were ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, me ka ọ ba na Babilon, tiye ya n'ulo-ndebe rue ubọchi ọnwu-ya.

12. Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadreza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, onye guzoro n'iru eze Babilon, batara na Jerusalem:

13. o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.

14. Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 52