N'ihi nka, le, ubọchi nābia, mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi nile apiri apiri nke Babilon, ihere gēme kwa ala-ya nile; ndi-ya nile eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya.