M'gēziga-kwa-ra Babilon ndi ala ọzọ, ndi gāfucha ya; ha gāwusi kwa ala-ya dika miri; n'ihi na ha nọ nēmegide ya buruburu n'ubọchi ihe ọjọ.