Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 5:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Inyinya azùru azù nke-oma nke nāb͕à nne-inyinya ka ha bu: nwoke ọ bula nime ha nēbeso nwunye madu-ibe-ya.

9. M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

10. Rigonu n'elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n'ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu.

11. N'ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

12. Ha agọnariwo Jehova, si, Ọ bughi Ya; ihe ọjọ agaghi-abiakwasi kwa ayi; ayi agaghi-ahu kwa mma-agha na oké unwu:

13. ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.

14. N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N'ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n'ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.

15. Le, anameme ka otù mba si n'ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.

16. Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike.

17. Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.

18. Ma ọbuná n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-eme ka unu gwusia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 5