Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 48:38-46 Bible Nso (IGBOB)

38. N'elu-ulo nile nke Moab na n'amá-ya nile, n'ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n'obi di: n'ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

39. Le ka esi tipia ya nke-uku! ha akwasiwo ákwá ike. Le ka Moab si b͕akuta azu n'ihere nke-uku! Moab aghọwo-kwa-ra ndi nile di ya buruburu ihe-ọchì na ihe-itu-ujọ.

40. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.

41. Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

42. Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n'ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.

43. Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

44. Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

45. N'okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n'etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n'isi nke umu nkpọtu.

46. Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n'iyì: n'ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n'agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n'agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 48