Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 48:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.

2. Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.

3. Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku!

4. Etikpọwo Moab; ndi-ntà-ya emewo ka anuru iti-nkpu.

5. N'ihi na nrigo Luhit ka o ji ikwa-ákwá nārigo nākwa ákwá; n'ihi na nime nrida Horonaim ka ha nuworo nkpà nke iti-nkpu nke ntikpọ.

6. B͕alaganu, wepuganu onwe-unu, di-kwa-nu ka osisi tamarisk n'ọzara.

7. N'ihi na ọ bu n'ihi na i tukwasiwo obi-gi n'ọlu-gi nile na n'àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n'ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.

8. Onye nāpunara madu ihe gābiaru kwa obodo nile ọ bula, ọ dighi kwa obodo ọ bula gēwepuga onwe-ya; ndagwurugwu gāla kwa n'iyì, agēme kwa ka ala di lari tọb͕ọrọ n'efu; dika Jehova siri.

9. Nyenu Moab nkù, n'ihi na ọ ghaghi ifepu efepu: obodo-ya nile gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye bi nime ha.

10. Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n'ọbara bu kwa.

11. Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 48