N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n'ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n'ọnu onye ọ bula nke Juda n'ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu.