Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 42:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. M'gēnye kwa unu ka enwe obi-ebere nile n'aru unu, ka o we nwe obi-ebere n'aru unu, me ka unu lata n'ala-unu.

13. Ma ọ buru na unu onwe-unu asi, Ayi agaghi-ebi n'ala nka; unu ewe ghara ige nti olu Jehova, bú Chineke-unu;

14. si, É-è; kama ọ bu n'ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ayi gēbi:

15. ma ub͕u a n'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n'Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n'ebe ahu;

16. ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gēru unu aru n'ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gārapara unu n'aru n'iso unu n'azu n'Ijipt; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu.

17. Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n'iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha.

18. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.

19. Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n'Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta.

20. N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:

21. m'we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m'were ya biakute unu.

22. Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 42