Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 4:14-30 Bible Nso (IGBOB)

14. Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi?

15. N'ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n'ugwu Efraim:

16. hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n'ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda.

17. Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18. Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n'ihi na ọ di ilu, n'ihi na o rutuwo obi-gi aru.

19. Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.

20. Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.

21. Rùe ole mb͕e ka m'gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?

22. N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.

23. Ahurum uwa, ma, le, ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tob͕oro nkiti; ahu-kwa-ram elu-igwe, ma ìhè-ha adighi.

24. Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu.

25. Ahurum, ma, le, ọ dighi madu di, anu-ufe nile nke elu-igwe efelawo kwa.

26. Ahurum, ma, le, ubi ọma bu ọzara, akwatusi-kwa-ra obodo-ya nile n'iru Jehova, n'iru iwe-Ya di ọku.

27. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile gābu; ma M'gaghi-eme ka ọ gwusia.

28. N'ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n'elu gēji kwa nji: n'ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M'gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.

29. Site n'olu ndi-inyinya na ndi-ọb͕a-uta obodo a nile nāb͕alaga; ha abawo n'ọhia b͕ara ọchichiri, ọ bu kwa na nkume nile di elu ka ha rigoworo: obodo ọ bula ka arapuworo, ọ dighi kwa onye ọ bula nēbi nime ha.

30. Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n'efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 4