11. Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n'ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n'ọzara, nēfe n'uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha;
12. ifufe nke juru eju nke sitere n'ebe ndia gābiaram: ub͕u a Mu onwem gēkwu kwa ọkwu ikpé nile n'ebe ha nọ.
13. Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi.
14. Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi?
15. N'ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n'ugwu Efraim:
16. hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n'ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda.
17. Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.