Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 39:3-11 Bible Nso (IGBOB)

3. na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.

4. O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n'obodo ahu pua, n'uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n'ọnu-uzọ-ama nke di n'etiti mb͕idi abua: o we pua ga n'uzọ Araba.

5. Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n'azu; rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n'ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.

6. Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n'anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.

7. O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, o were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ime ka ọ ba Babilon.

8. Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n'ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.

9. Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon.

10. Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n'ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n'ubọchi ahu.

11. Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 39