Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 31:5-22 Bible Nso (IGBOB)

5. I gāku kwa ubi-vine ọzọ n'elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha.

6. N'ihi na otù ubọchi gādi mb͕e ndi-nche ndi nọ n'ugwu Efraim gākpọ, si, Bilienu, ka ayi rigorue Zaion jekuru Jehova, bú Chineke-ayi.

7. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n'isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru.

8. Le, M'gaje ime ka ha si n'ala Ugwu bia, M'gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n'etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n'otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n'ebe a.

9. N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.

10. Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.

11. N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.

12. Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.

13. Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.

14. M'gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

15. Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n'ihi na ha adighi.

16. Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n'ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n'ọlu-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n'ala onye-iro lata.

17. Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n'iru-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n'ókè-ala-ha.

18. Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.

19. N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.

20. Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

21. Me ka ogidi di iche iche iri uzọ ama guzoro onwe-gi ọtọ, doro onwe-gi ide di iche iche iri uzọ ama: tukwasi obi-gi n'uzọ ahu atuliri atuli, bú uzọ nke i jere ije nime ya: lata, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú israel, lata n'obodo-gi ndia.

22. Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n'ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n'uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 31