Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 30:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha.

17. N'ihi na M'gēme ka anu-aru ọhu puchie n'aru gi, M'gāgwọpu kwa gi n'ọnyá-gi nile etiputara, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nwanyi achupuru achupu ka ha kpọworo gi, si, Zaion ka ọ bu, ọ dighi onye nāchọ ya.

18. Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n'agha lata, ọ bu kwa n'aru ebe-obidi-ya nile ka M'gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n'elu obo-ya, agēbi kwa n'ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.

19. Ekele na olu nke ndi-ngwuri gēsi kwa nime ha puta: M'gēme kwa ka ha ba uba, ha agaghi-adi kwa ole-na-ole; M'gēme kwa ka ha di nsọpuru ha agaghi-adi kwa ntà.

20. Umu-ha gādi kwa ka ha si di na mb͕e ochie, nzukọ-ha gēguzosi kwa ike n'irum, M'gēji kwa nmehie nke ndi nile nēmeb͕u ya leta ha.

21. Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 30