Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 3:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere.

4. Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m'nwere n'ab͕ọghọ ka I bu?

5. Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.

6. Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.

7. M'we si, mb͕e ọ mesiri ihe ndia nile, Ya laghachikutem; ma ọ laghachigh: nwa-nne-ya nke nāghọb͕u, bú Juda, we hu ya.

8. M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.

9. O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 3