Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

2. Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.

3. Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere.

4. Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m'nwere n'ab͕ọghọ ka I bu?

5. Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.

6. Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 3