Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 29:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi M'meworo ka eme ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:

5. Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha;

6. luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n'ebe ahu, ghara ibilata.

7. Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M'meworo ka eme ka unu je biri n'ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n'ihi na n'udo-ya ka udo gādiri unu.

8. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n'etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha.

9. N'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n'aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

10. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.

11. N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.

12. Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti.

13. Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 29