Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 29:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku:

23. n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

24. Ọzọ, okwu bayere Shemaia, bú onye-Nehelamait, ka i gēkwu, si,

25. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N'ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n'aha-gi, si,

26. Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n'ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n'ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n'ọtọsi na nime nkpọrọ olu.

27. Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n'ebe unu nọ,

28. n'ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n'ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha?

29. Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma.

30. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 29