Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 29:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.

14. M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.

15. N'ihi na unu asiwo, Jehova emewo ka ndi-amuma biliere ayi nime Babilon.

16. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n'oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n'obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n'ala ọzọ ebe emere ka unu je biri;

17. otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.

18. M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:

19. n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

20. Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n'ala ọzọ, ndi M'zigara si na Jerusalem rue Babilon.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 29