Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 25:31-37 Bible Nso (IGBOB)

31. Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n'ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ'gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

32. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n'otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa.

33. Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ.

34. Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.

35. Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu.

36. Ge nti olu iti-nkpu nke ndi-ọzùzù-aturu, na nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu! n'ihi na Jehova nēbibi ebe-ita-nri-ha.

37. Emewo kwa ka ulo-obibi nile nke di n'udo dere du site n'iwe di ọku nke Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 25