Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 25:25-31 Bible Nso (IGBOB)

25. na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;

26. na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n'ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n'elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.

27. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu.

28. Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n'aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu.

29. N'ihi na, le, ọ bu n'obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n'ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n'uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

30. Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n'elu bib͕ọ, si kwa n'ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n'uwa.

31. Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n'ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ'gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 25