Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 25:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n'ofè oké osimiri;

23. Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;

24. na eze nile nke Arebia, na eze nile nke ndi gwara ọgwa ndi bi n'ọzara;

25. na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;

26. na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n'ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n'elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.

27. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu.

28. Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n'aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 25