Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 25:15-33 Bible Nso (IGBOB)

15. N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.

16. Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti ha.

17. M'we nara iko ahu n'aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru:

18. bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta;

19. Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile;

20. na ndi nile gwara, ọgwa na eze nile nke ala Uz, na eze nile nke ala ndi Filistia, na Ashkelon, na Geza, na Ekron, na ndi Ashdod fọduru;

21. na Edom, na Moab, na umu Amon;

22. na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n'ofè oké osimiri;

23. Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;

24. na eze nile nke Arebia, na eze nile nke ndi gwara ọgwa ndi bi n'ọzara;

25. na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;

26. na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n'ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n'elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.

27. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu.

28. Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n'aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu.

29. N'ihi na, le, ọ bu n'obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n'ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n'uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

30. Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n'elu bib͕ọ, si kwa n'ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n'uwa.

31. Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n'ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ'gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

32. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n'otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa.

33. Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 25