Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 25:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi Juda nile n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda; nke ahu bu arọ mbu nke Nebukadreza, bú eze Babilon;

2. bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si:

3. Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.

4. Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n'ala inu;

5. nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n'uzọ ọjọ ya na n'ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n'elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru:

6. unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha na ikpọ isi ala nye ha, unu eji-kwa-la ọlu aka-unu kpasum iwe; M'gaghi-eme kwa unu ihe ọjọ.

7. Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.

8. N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N'ihi na unu anughi okwum nile,

9. le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 25