Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 22:8-11 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọtutu mba gāgabiga kwa n'akuku obodo a, ha gāsirita kwa ibe-ha n'otù n'otù, N'ìhi gini ka Jehova meworo obodo uku a otú a?

9. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.

10. Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.

11. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n'ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n'ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n'ebe ahu ọzọ;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 22