Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 22:23-30 Bible Nso (IGBOB)

23. Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n'etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme!

24. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n'aka-nrim, ma ọbuná n'ebe ahu ka M'gādọpu gi;

25. M'gēnye kwa gi n'aka ndi nāchọ ndu-gi, na n'aka ndi gi onwe-gi nātu ujọ ha, bú n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi Kaldea.

26. M'gētufu kwa gi na nne-gi onye muru gi, rue ala ọzọ, ebe anāmughi unu; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu.

27. Ma n'ala ahu nke ha onwe-ha nātukwasi nkpuru-obi-ha, si na ha gālaghachi n'ebe ahu, n'ebe ahu ka ha nagaghi-alaghachi.

28. Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi?

29. Ala, ala, ala, nuru okwu Jehova.

30. Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 22