Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 17:9-22 Bible Nso (IGBOB)

9. Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?

10. Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.

11. Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.

12. Oche-eze nke di ebube, nke di n'elu site na mbu, ọnọdu nke ebe nsọ ayi,

13. olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.

14. Me ka m'diri ndu, Jehova, m'we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n'ihi otutom ka I bu.

15. Le, ndi ahu nāsim, Òle ebe okwu Jehova di? biko, ya bia.

16. Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.

17. Aghọlam ihe-ujọ: ebe-nb͕abàm ka I bu n'ubọchi ihe ọjọ.

18. Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.

19. Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n'ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;

20. si ha, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na Juda nile na ndi nile bi na Jerusalem, bú ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia:

21. otú a ka Jehova siri: Lezienu onwe-unu anya, unu ebu-kwa-la ibu n'ubọchi-izu-ike, unu ebubà-kwa-la ya n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;

22. unu agaghi-ebupu kwa ibu n'ulo-unu n'ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M'nyere nna-unu-hà iwu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 17