Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 17:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ejiwo pen ígwè, ji kwa ọnu-ọnu diamond, de nmehie Juda: atuwo ya n'elu mbadamba nkume, bú obi-ha, na n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nile nke umu;

2. ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n'akuku osisi ndu n'elu ugwu ntà ha nile di elu.

3. Gi ugwum nke di n'ọhia, ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, M'gēnye kwa ebe-gi nile di elu, n'ihi nmehie, n'ókè-ala-gi nile.

4. I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.

5. Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 17