Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 15:19-21 Bible Nso (IGBOB)

19. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Ọ buru na i lata, M'gēme kwa ka i lata, n'irum ka i gēguzo; ọ buru na i me ka ihe di oké ọnu-ahia si n'ihe jọb͕uru onwe-ya puta, dika ọnum ka i gābu: ndi ahu gālaghachikute gi, ma gi onwe-gi agaghi-alaghachikute ha.

20. M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

21. M'gānaputa kwa gi n'aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 15