Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 15:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa.

2. O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n'agha gāpukuru ndọta-n'agha.

3. M'gēme kwa ka ab͕uru ihe anọ buru ndi-nlekọta-ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mma-agha ib͕u eb͕u, na nkita idọb͕u adọb͕u, na anu-ufe nke elu-igwe, na anumanu nke uwa, iripia na ibibi.

4. M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.

5. N'ihi na ònye gēnwe ọmiko n'aru gi, Jerusalem? ma-ọbu ònye gēgosi gi ebere o nwere n'aru gi? ma-ọbu ònye gēwezuga onwe-ya iju ajuju bayere udo-gi?

6. Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M'we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.

7. M'we were ihe-nfucha fucha ha n'ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n'iyì; ha esighi n'uzọ nile ha lata.

8. Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.

9. Nwayi nke muworo umu asa atalatawo; o kubìwo ume; anyanwu-ya adawo mb͕e ubọchi fọduru; ihere emewo ya, o we nwe iru-ihere: ọzọ, ndi-ha fọduru, ọ bu n'aka mma-agha ka M'gēnye ha n'iru ndi-iro-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 15