Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 13:9-19 Bible Nso (IGBOB)

9. Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem.

10. Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n'isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n'ihe ọ bula.

11. N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.

12. I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine?

13. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.

14. M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.

15. Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n'obi: n'ihi na Jehova ekwuwo.

16. Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.

17. Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha.

18. Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.

19. Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n'ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n'ala ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 13