Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 12:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?

2. I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya.

3. Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.

4. Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.

5. Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n'obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n'ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 12