Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 11:12-21 Bible Nso (IGBOB)

12. Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.

13. N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

14. Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha.

15. Gini ka nwayi nke ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere n'ulom, ebe ya na ọtutu madu meworo ajọ ihe-nzube, ọzọ, anu nsọ nēsi kwa n'aru gi gabiga? mb͕e i nēme ihe ọjọ, mb͕e ahu ka i nāṅuri ọṅu.

16. Osisi olive di ndu, nke mara nma n'imì nkpuru ọma, otú a ka Jehova kpọrọ aha-gi: n'olu nkpọtu uku ka O suyeworo ya ọku, alaka-ya nile anyakasiwo kwa.

17. N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n'ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n'ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n'ikpasum iwe n'isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

18. Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha.

19. Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n'ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ.

20. Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n'ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpem.

21. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n'aha Jehova, ka i we ghara inwu site n'aka-ayi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 11