Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 11:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu nke ruru Jeremaia nti site n'aka Jehova, si,

2. Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu;

3. i gāsi kwa ha, Otúaka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Onye anābu ọnu ka onye ahu bu nke nādighi-anu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a,

4. nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, si n'oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M'nēnye unu n'iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:

5. ka M'we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M'we za, si, Amen, Jehova.

6. Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 11