Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 10:17-24 Bible Nso (IGBOB)

17. Chikọputa ihe-agha-gi n'ala, gi onye bi n'obodo anānọchigide n'agha.

18. N'ihi na otú a ka jehova siri, Le, M'gaje imapu ndi bi n'ala nka dika èbè na mb͕e a, M'gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha.

19. Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N'ezie nka bu ọriam, m'gēburu kwa ya.

20. Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n'ebe m'nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam.

21. N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.

22. Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n'ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia.

23. Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

24. Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 10