Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 8:10-21 Bible Nso (IGBOB)

10. Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n'ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ;

11. nduru ahu we bakute ya na mb͕e anyasi; ma, le, akwukwọ osisi olive akubitere ọhu di n'ọnu-ya: Noa we mara na miri esiwo n'elu uwa taba.

12. Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ, zipu nduru ahu; ma ọ laghachikuteghi ya ọzọ ma-ọli.

13. O rue, n'arọ nke-nnù na ọgu iri na otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na miri siri n'elu uwa tasia: Noa we wezuga ihe-nkpuchi nke ub͕ọ ahu, hu, ma, le, iru ala kpọrọ nku.

14. Ọ bu n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa, ka ala kọsiri.

15. Chineke we gwa Noa okwu, si,

16. Si n'ub͕ọ pua, gi onwe-gi, na nwunye-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.

17. Anu nile ọ bula nke di ndu nke gi na ya nọ, bú nke sitere n'anu-aru nile, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime ihe nile nākpu akpu nke nākpu akpu n'uwa, gi me ka ha so gi puta; ka ha we nuputa n'uwa, mua ọmùmù, ba uba n'elu uwa.

18. Noa we pua, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom:

19. anu nile ọ bula nke di ndu, ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, na anu-ufe nile ọ bula, ihe ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, dika ab͕uru-ha si di, ha siri n'ub͕ọ pua.

20. Noa we wuere Jehova ebe-ichu-aja, were ufọdu nime anu-ulo nile ọ bula di ọcha na nime anu-ufe nile ọ bula di ọcha, sure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-aja ahu.

21. Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 8