Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 7:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile.

4. N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.

5. Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.

6. Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n'elu uwa.

7. Noa we si n'iru miri nke iju-miri ahu ba n'ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom.

8. Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 7