Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 5:17-26 Bible Nso (IGBOB)

17. ubọchi nile nke Mahalalel we buru nnù arọ abua na ọgu anọ na iri na ise: o we nwua.

18. Jered di ndu ọgu arọ asatọ na abua, ọ mua Inok:

19. Jered di ndu, mb͕e ọ musiri Inok, nnù arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

20. ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua.

21. Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela:

22. Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

23. ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise:

24. Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.

25. Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek:

26. Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 5