Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 5:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Nka bu akwukwọ osuso-ọmumu nile nke Adam. N'ubọchi Chineke kere madu, n'oyiyi Chineke ka O mere ya;

2. nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n'ubọchi ekere ha.

3. Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n'oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set:

4. ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

5. Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.

6. Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:

7. Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

8. ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 5