Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 48:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa.

17. Josef we hu na nna-ya nātukwasi aka-nri-ya n'isi Efraim, ọ we jọ njọ n'anya-ya: ọ we welie aka nna-ya, iwepu ya n'isi Efraim tiye n'isi Manase.

18. Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya.

19. Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile.

20. Ọ we gọzie ha n'ubọchi ahu, si, Nime gi ka Israel gāgọzi, si, Chineke me gi ka i di ka Efraim, ka i di kwa ka Manase: ọ we do Efraim n'iru Manase.

21. Israel we si Josef, Le, mu onwem gaje inwu: ma Chineke gānọyere unu, me kwa ka unu lata n'ala nna-unu-hà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 48