Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 46:28-34 Bible Nso (IGBOB)

28. Ma ọ bu Juda ka o zigara n'iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n'iru ya rue Goshen; ha we bata n'ala Goshen

29. Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya.

30. Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a.

31. Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n'ala Kenean, abiakutewom;

32. ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo.

33. Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu?

34. na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 46