22. Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.
23. O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ.
24. Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ.
25. Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha.
26. Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha.
27. Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu: