Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 45:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya.

2. Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara.

3. Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n'ihi na ha mara jijiji n'iru ya.

4. Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt.

5. Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu.

6. N'ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n'etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi.

7. Chineke we zìem ga n'iru unu idoro unu n'uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu.

8. Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile.

9. Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ:

10. i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 45