Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 44:21-34 Bible Nso (IGBOB)

21. I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m'we tukwasi anyam n'aru ya.

22. Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu.

23. I we si ndi-orù-gi, Ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà esoghi unu ridata, unu agaghi-ahu irum ọzọ ma-ọli.

24. O rue, mb͕e ayi rigokuru orù-gi, bú nnam, na ayi gosiri ya okwu nile nke onye-nwem.

25. Nna-ayi we si, Jeghachinu, zutara ayi nwantī ihe-oriri.

26. Ayi we si, Ayi apughi irida: ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà eso ayi je, ayi gārida kwa; n'ihi na ayi apughi ihu iru nwoke ahu, ma ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà esoghi ayi je.

27. Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem:

28. otù nime ha we si n'ebe m'nọ pua, m'we si, N'ezie anu-ọhia adọb͕usiwo ya; ahughi-kwam ya rue ub͕u a:

29. ma ọ buru na unu ekupu kwa nka n'irum, ajọ ihe adakwasi kwa ya, unu gēweda isi-awọm rue ala-mọ n'ihe ọjọ.

30. Ma ub͕u a, mb͕e m'gābiakute orù-gi, bú nnam, ma nwa-okoro ahu esoghi ayi bia; ebe ekekọtara nkpuru-obi-ya na nkpuru-obi nwa-okoro ahu;

31. o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta.

32. N'ihi na orù-gi nọrọ nwa-okoro ahu mbe n'ebe nnam nọ, si, Ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, eme-hiewokwam megide nnam ubọchi ndum nile.

33. Ma ub͕u a, biko, ka orù-gi nọdu n'ọnọdu nwa-okoro a iburu onye-nwem orù; ma ka nwa-okoro a soro umu-nne-ya rigo.

34. N'ihi na m'gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m'we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 44