Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 44:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. Tiye kwa ọkwam, bú ọkwa ọla-ọcha, n'ọnu akpa onye nke-ntà, ya na ego ọka-ya. Ọ we me dika okwu Josef si di, nke o kwuru.

3. Mb͕e ìhè ututu putara, ewe zilaga ndikom ahu, ha na inyinya-ibu-ha.

4. Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe?

5. Ọ̀ bughi nka bu ihe onye-nwem ji aṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya ji kwa ya ariba ama n'ezie? unu emewo ihe ọjọ n'ihe nke unu mere.

6. Ọ we rue ha aru, gwa ha okwu ndia.

7. Ha si ya, N'ìhi gini ka onye-nwem nēkwu okwu dika okwu ndia? Ya buru ndi-orú-gi ihe-árú ime ihe dika ihe a.

8. Le, ego nke ayi hutara n'ọnu akpa-ayi, ayi si n'ala Kenean weghachiri gi ya: àyi gēsi kwa aṅa si n'ulo onye-nwe-gi zuru ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo?

9. Onye ọ bula n'etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n'aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù.

10. Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya.

11. Ha we me ngwa, weda akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya, ha meghe akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya.

12. Ọ we chọsie ike, n'okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n'akpa Benjamin.

13. Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n'obodo.

14. Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya.

15. Josef we si ha, Òmume gini bu nka nke unu meworo? ùnu amaghi na nwoke nke di kam nāriba ama n'ezie?

16. Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n'aka-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 44